Anthony Obum Okorie: Igbo si na ikuku kuo ahu ike okuko. Nke bu - TopicsExpress



          

Anthony Obum Okorie: Igbo si na ikuku kuo ahu ike okuko. Nke bu eziokwu bu na o doola oke na ngwere anya na nwanyi i tinye aka na ndoro ndoro ochichi bu ihe di nma i nyocha enyocha. Ihe kpatara m ji wee na-ekwu ihea bu ihe na-emezi n’obodo anyi bu Najiria ugbua. Otutu umu nwanyi jizi ike di na apatapa ukwu ha, na-azo ya bu ndoro ndoro ochichi. O bu ihe jokariri udele na njo na nwoke ga alu nwanyi luoro ya nwoke ibe ya. Nke kachasi agbawa obi bu na nwanyi ga a hapu be di ya gaa hie ama ebe a na-azo ndoro ndoro ochichi. Ikwu eziokwu a chokwara m ka oriaku m buru udiri mmadu dika Dora Akunyili ma o bu Oby Ezekwesili. Mana o na a dikwa nu nma onye choo izu ahia, o gbaa uru, o gbaakwa nu ogho m di n’ime ya. Nkea echeterela m ihe anyi nuru n’izu uka gara aga gbasara nwa ada aha ya bu Adaobi . Ndi be anyi nke bu eziokwu bu na oke nile na-eri azu mana o bu nke a huru ya n’onu ka a na-akpo ajo aha. Ihe di be odu dikwa nu be oguna. Enyochaa enyochaa otutu n’ime umu nwanyi banyere na ndoro ndoro ochichi, bu otu ugbo bu ha na Adaobi. Ya kpatara o ji wee di mkpa na umu ada anyi ga elezi anya ofuma mara na obughi ihe nile nwoke tinyere aka , ka ha ga e tinye aka. Kedu uru o bara na nwata nwanyi ga a macha nma e were akpa garri kwara ya akwa? Onye mara asu , ya suo n’ikwe. Ka anyi bu uzo chowa ewu oji …………… Okoro erughi eru wara akwa ikuku bia………… UDO DIRI UNU UMU IGBO.
Posted on: Mon, 19 Aug 2013 09:30:26 +0000

Trending Topics



Recently Viewed Topics




© 2015